1 Corinthians 9:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ bụla m bịara nꞌetiti ndị Juu ana m eme dị ka onye Juu, ka m nwee ike nwetara Kraịst ụfọdụ nꞌime ha. Ọ bụ ezie na anọghị m nꞌokpuru iwu Mosisi, ma mgbe m nọ nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-ebi ndụ dị ka usoro okpukpe iwu ndị Juu si dị, ana m emekwa dị ka m bụ otu nꞌime ndị nọ nꞌokpuru iwu, ka m si otu a nwee ike ikwusara ha ozi ọma, inyere ha aka.
Igbo 2006
N'ebe ndi-Ju nọ m'we di ka onye-Ju, ka m'we rita ndi-Ju n'urù; n'ebe ndi nọ n'okpuru iwu di m'we di ka onye nọ n'okpuru iwu, ọ bughi na mu onwem nọ n'okpuru iwu, ka m'we rita ndi nọ n'okpuru iwu n'urù;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru.