1 Corinthians 9:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu aka ahụ kwa, mgbe mụ na ndị mba ọzọ na-anọghị nꞌokpuru iwu nọkọrọ, ana m eme dị ka ha si eme ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a mee ka ha mata Kraịst. Ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe Chineke na-achọ. Mba! Ana m emekwarị dị ka onye nọ nꞌokpuru iwu Kraịst.
Igbo 2006
n'ebe ndi nēnweghi iwu nọ m'we di ka onye nēnweghi iwu, ọ bughi na enweghm iwu n'ebe Chineke nọ, kama anọm n'okpuru iwu n'ebe Kraist nọ, ka m'we rita ndi nēnweghi iwu n'urù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru.