1 Corinthians 9:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.
Igbo 2006
Madu ọ bula nke nāb͕asi nb͕a ike ika ibe-ya n'egwú-unu nējide kwa onwe-ya n'ihe nile. Ya mere, ndi ahu nēme ya inata okpu-nmeri nke puru ire uré; ma ayi onwe-ayi nēme ya inata okpu-nmeri nke nāpughi ire uré.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.