1 Corinthians 9:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.
Igbo 2006
Ya mere mu onwem nāb͕a ọsọ otú a, dika onye nādighi-ab͕a nēleghi anya ihe; otú a ka m'nēsu ọkpọ, dika onye nādighi-apia ifufe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe.