1 Corinthians 9:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.
Igbo 2006
ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.