1 John 1:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị na-ekwusa banyere ihe ahụ anyị hụrụ, na nke anyị nụrụ, nꞌihi na anyị chọrọ ka unu soro anyị nwee nnwekọ, bụ nnwekọ ahụ anyị na Nna na Ọkpara ya nwekọrọ.
Igbo 2006
ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.