1 John 2:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụmụ m, ana m edere unu ihe ndị a nile ka unu si nꞌime mmehie pụta. Ọ bụrụkwanụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee mmehie, anyị nwere Jisọs Kraịst, onye na-eguzo nꞌihu Chineke, bụ Nna anyị, arịọrọ anyị arịrịọ. Jisọs Kraịst pụrụ ime nke a nꞌihi na ọ dị ọcha bụrụkwa onye na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nꞌụzọ nile.
Igbo 2006
Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.