1 John 2:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu ndị okenye ka m na-edere ihe ndị a, nꞌihi na unu maara Kraịst, onye ahụ na-adị ndụ site na mbụ, mgbe ọ na-adịghị ihe e kere eke dị. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka m na-edere unu ụmụ okorọbịa, nꞌihi na unu emeriela ekwensu. Ana m edekwara unu ihe a unu ụmụntakịrị nwoke na nwanyị nꞌihi na unu anụla, kwerekwa na Chineke onye bụ Nna anyị.
Igbo 2006
Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Nna-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.