1 John 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ana m agwa unu ndị bụ nna maara Chineke ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi, na-agwakwa unu ụmụ okorọbịa dị ike, ndị okwu Chineke juru obi, ndị na-emeri ekwensu nꞌọgụ ọ na-alụso unu sị
Igbo 2006
Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.