1 John 2:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, ọgwụgwụ ụwa abịaruola. Unu anụla ihe banyere onye iro Kraịst ahụ na-abịa a na-akpọ onye na-emegide Kraịst. Nꞌezie, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ejupụtala ebe nile. Nke a na-egosi anyị na ọgwụgwụ ụwa adịla nso.
Igbo 2006
Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.