1 John 2:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị a na-emegide Kraịst ugbu a si nꞌọgbakọ anyị pụọ. A sị na ha bụ ndị na-eso Kraịst nꞌezie ha agaraghị esite nꞌọgbakọ anyị pụọ. Ma ha hapụrụ anyị pụọ igosi na o nweghị oge ha ji bụrụ ndị na-eso Kraịst.
Igbo 2006
Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.