1 John 2:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, nọgidesienụ ike nꞌime Kraịst. Mgbe ọ bịara ọzọ ka obi unu bụrụ ihe kwenyesịrị ike nꞌime ya. Nꞌụzọ dị ọtu a unu agaghị abụ ndị ihere ga-eme mgbe unu hụrụ ya. Unu agaghị abụkwa ndị na-adọghachi onwe ha azụ site nꞌebe ọ nọ.
Igbo 2006
Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n'iru Ya n'ọbibia-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara.