1 John 2:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ndị ahụ na-edebe iwu Kraịst, ndị na-eme ihe ọ chọrọ ga-amụta otu e si ahụ Chineke nꞌanya. Nke a bụkwa ụzọ e si ama onye bụ onye nke Kraịst nꞌezie.
Igbo 2006
ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.