1 John 2:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụnna m ndị m hụrụ nꞌanya, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-enye unu idebe kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ unu nwere site na mbụ. Ọ bụkwa otu iwu ahụ unu maara ihe banyere ya.
Igbo 2006
Ndi m'huru n'anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n'iwu nkem m'nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n'iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n'iwu bu okwu ahu nke unu nuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya.