1 John 2:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ bụ iwu na-adị ọhụrụ oge nile, nke nwekwara ike ịrụrụ unu ọrụ dị ka o si rụọra Kraịst ọrụ. Oge nile anyị na-eme ihe iwu ahụ kwuru, ya bụ ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, mgbe ahụ ka ọchịchịrị nile dị nꞌime anyị na-apụ, na-enye ìhè ọhụrụ nke ndụ a na-ebi nꞌime Kraịst ohere ka o nwupụta.
Igbo 2006
Ọzọ, ihe ọhu enyere n'iwu ka m'nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n'ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.