1 John 3:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, anyị pụrụ ịkọwa onye bụ nwa Chineke na nwa ekwensu. Onye ọ bụla na-ebi ndụ ime mmehie na nke na-ahụghị nwanna ya nꞌanya esiteghị nꞌezinụlọ Chineke.
Igbo 2006
Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya esighi kwa na Ya puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.