1 John 3:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ọ bụla kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ nꞌime obi ya. Anyị maara na o nweghị onye na-eche echiche igbu mmadụ pụrụ inwe ndụ ebighị ebi.
Igbo 2006
Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.