1 John 3:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị m hụrụ nꞌanya, ka ngosi anyị na-egosi ịhụnanya anyị nꞌebe ndị ọzọ nọ ghara ịbụ nanị nꞌegbugbere ọnụ anyị na ikwu okwu efu. Kama ka anyị na-egosi ya site nꞌokwu ọnụ anyị na omume anyị.
Igbo 2006
Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n'anya n'okwu, ma-ọbu n'ire; kama ka ayi nāhu n'anya n'ọlu na ezi-okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.