1 John 3:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị nile na-eme ihe Chineke kwuru na-anọgidesikwa ike nꞌime ya. Chineke nꞌonwe ya na-anọgidesikwa ike nꞌime onye ahụ. Anyị maara na nke a bụ eziokwu nꞌihi na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị na-agwa anyị otu ihe ahụ.
Igbo 2006
Onye nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu nānọgide nime Ya, Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ya. Nime nka ka ayi makwara na Ọ nānọgide nime ayi, site na Mọ Nsọ ahu Nke O nyere ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.