1 John 3:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na ị na-anọgide na-ebi ndụ ime mmehie oge nile, o gosiri na ị bụ nke ekwensu. Nꞌihi na ekwensu bụ onye na-emehie site na mmalite ihe dum. Mmehie bụkwa aka ọrụ ya. Ma Jisọs Ọkpara Chineke bịara nꞌụwa ịla ike na ọrụ nile nke ekwensu nꞌiyi.
Igbo 2006
onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.