1 John 4:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile.
Igbo 2006
Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.