1 John 4:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anyạ anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nꞌanya, Chineke na-ebi nꞌime anyị. Ịhụnanya ya kwa na-eto eto nꞌime anyị.
Igbo 2006
Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n'anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n'anya-Ya zue okè nime ayi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.