1 John 4:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie.
Igbo 2006
Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.