1 John 4:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụzọ unu ga-esi mata ma okwu unu nụrụ o si nꞌaka Mmụọ Chineke bụ nke a, ọ̀ na-ekwupụta na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke ghọrọ mmadụ jiri anụ ahụ mmadụ bịa nꞌụwa? Ọ bụrụ na okwu ahụ kwagidere na Jisọs bịara nꞌụdị mmadụ nꞌụwa mgbe ahụ okwu ahụ bụ nke si nꞌebe Chineke nọ bịa.
Igbo 2006
Nime nka ka unu mara Mọ nke Chineke: mọ ọ bula nke nēkwuputa na Jisus Kraist abiawo n'anu-aru bu mọ nke siri na Chineke puta:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke.