1 John 4:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na nkwusa ahụ asị na Jisọs esighị otu a bịa, ọ bụghị nke si nꞌebe Chineke nọ pụta. Ọ bụ nkwusa okwu ụgha ahụ, nke si nꞌebe onye iro Kraịst bịa. Unu anụla ihe banyere ọbịbịa ya. Ndị ozi ya jupụtara ụwa taa.
Igbo 2006
ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n'oge di ub͕u a ka ọ nọ n'uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa.