1 John 4:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma anyị bụ ụmụ Chineke, ya mere, ọ bụ nanị ndị maara Chineke ga-ege anyị ntị. Ndị ụwa agaghị ege anyị ntị nꞌihi na ha amaghị Chineke. Nke a bụkwa ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta onye si nꞌọnụ ndị nkwusa na-ekwu okwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke esi nꞌọnụ ha kwuo okwu ụwa agaghị anabata ya.
Igbo 2006
Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.