1 John 5:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na i kwere nꞌezie na Jisọs bụ Kraịst onye nzọpụta gị na Ọkpara Chineke, ị bụ nwa Chineke. Ndị nile kwa hụrụ Chineke nꞌanya naahụkwa ụmụ Chineke nꞌanya.
Igbo 2006
Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.