1 John 5:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nꞌime Kraịst ka ọ na-eme mmehie na-adịghị edube onye na-eme ya nꞌọnwụ, kpee ekpere nꞌihi ya rịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Chineke ga-enyekwa ya ndụ. Ọ bụ nanị mgbe ị maara na mmehie ya bụ nke na-eduba onye mere ya nꞌọnkụ ka ị ga-ahapụ ikpere ya ekpere.
Igbo 2006
Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.