1 John 5:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O nweghị onye ọ bụla a gbapụtara kpọbata nꞌezinụlọ Chineke ga-anọgide na-eme mmehie, nꞌihi na Kraịst Ọkpara Chineke na-echebe ya ka onye iro ahụ bụ ekwensu hapụ imetụ ya aka.
Igbo 2006
Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.