1 John 5:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye matakwara na Jisọs bụ Okpara Chineke nꞌihi na Chineke si nꞌeluigwe kwuo na Jisọs bụ Ọkpara ya mgbe e mere Jisọs baptizim. Chineke kwukwara okwu dị otu a nꞌoge ọnwụ Jisọs. Ee, olu esiteghị nꞌeluigwe kwuo okwu nanị nꞌoge e mere Jisọs baptizim, kama o kwuru okwu nꞌoge ọnwụ ya.
Igbo 2006
Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.