1 John 5:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụlọ ikpe anyị, anyị na-anabata ọgụgba ama ndị mmadụ dị ka eziokwu. Anyị kwesịkwara ịnabata ama Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke kwuru na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara ya.
Igbo 2006
Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.