1 Kings 1:51 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ewe gosi Solomon, si, Le, Adonaija nātu egwu eze, bú Solomon: ma, le, o jidewo mpi ebe-ichu-àjà aka, si, Ka eze, bú Solomon, buru uzọ ṅuaram iyi na ọ gaghi-ewere mma-agha me ka orù-ya nwua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ”