1 Kings 1:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Adonaija we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi na anu mara abuba chua àjà n'akuku nkume Zohelet, nke di n'akuku En-rogel; o we kpọ umu-nne-ya nile, bú umu-ndikom eze, na ndikom nile nke Juda, bú ndi-orù eze;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku,