1 Kings 10:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ kwa, ub͕ọ Hairam, nke siri n'Ofia bute ọla-edo, ha siri n'Ofia bubata osisi almug bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
(Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.