1 Kings 10:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.