1 Kings 11:34 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma M'gaghi-ewepu ala-eze nile n'aka-ya: kama onye-isi ka M'gēdo ya ubọchi nile nke ndu-ya, n'ihi Devid, bú orùm, onye M'rọputara, n'ihi na ọ debere ihe nile M'nyere n'iwu na ukpurum nile:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.