1 Kings 11:38 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M'gēnye gi n'iwu, ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, me ihe ziri ezi n'anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M'gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M'wuru Devid, M'gēnye kwa gi Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel.