1 Kings 12:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu Onyenwe anyị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.