1 Kings 13:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.