1 Kings 13:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)