1 Kings 13:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i nupuwo isi n'okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n'iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị, hapụ idebe iwu Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị.