1 Kings 13:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.