1 Kings 13:26 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-amuma ahu nke mere ka o si n'uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu Onyenwe anyị. Onyenwe anyị enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu Onyenwe anyị dọrọ ya aka na ntị.”