1 Kings 15:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo.