1 Kings 16:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-eze-ya, na o tib͕uru ulo Beasha nile: o kweghi ka otù nwa-nwoke fọduru ya, ma ọ bu nime ndi-ikwu-ya, ma-ọbu nime ndi-eyì-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile.