1 Kings 16:31 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn. O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe.