1 Kings 18:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla.