1 Kings 18:23 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ka ha nye kwa ayi oke-ehi abua; ka ha rọputa-kwa-ra onwe-ha otù oke-ehi, bọ ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú, ma ka ha ghara itiye ọku: mu onwem gēdozi kwa oke-ehi nke-ọzọ, tiye n'elu nkú, ma m'gaghi-etiye ọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma Baal họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya.