1 Kings 2:22 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Eze, bú Solomon, we za, si nne-ya, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāriọrọ Adonaija Abishag, bú nwayi Shunem? riọ-kwa-ra ya ala-eze; n'ihi na ya onwe-ya bu nwa-nnem nke-okenye; riọrọ ya ala-eze, riọ-kwa-ra Abaiata, bú onye-nchu-àjà, riọ-kwa-ra Joab nwa Zeruaia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.