1 Kings 2:27 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.